Iglesia Catolica Palmariana

OTU NZUKỌ, NSỌ, KATỌLIK, APOSTỌLIC NA PALMARIAN

Nkea bụ Ezi Nzukọ Katọlik nke ekpo nile,
nke Dinweụ Anyị Jesu Kristi debere.
Nnọchite ziri ezi n’oche ọchịchị Peter dị Asọ nke Onye nọ na ya kịta bu Pope Peter III,
De Glória Ecclésiæ

Nkea bụ Ezi Nzukọ Katọlik nke ekpo nile, nke Dinweụ Anyị Jesu Kristi debere. Nnọchite ziri ezi n’oche ọchịchị Peter dị Asọ nke Onye nọ na ya kịta bu Pope Peter III,
De Glória Ecclésiæ

Nkea bụ sọ Akwụ mgbasa ozi nke otu Nzukọ, Nsọ, Katọlik, Apostọlic na Palmaria, bụ nke Nna Ukwu nke Otu Carmelite nke Iru De Asọ bụ Pope Peter III kwadoro, ma nye ike mgbasa ozi. Iji mee ihe nchọpụta banyere Nzukọ Katọlik nke Palmar, ọdị nkpa n’aga eje n’akwụ mgbasa ozi nke nyabụ Nzukọ debere, ma nye ike ịlụ ọlụ. Edepụtara na njedebe edemede a, otu uzọ enwere ike iji zie ozi ruo Nzukọ ntị. Imerime ihe ndị ọzọ ana edepụtasị na “internet” enweghị eziokwu dị na ha, mana ha n’ebutekarị mgbagwoju anya makana ha akwụghị ekeresi.

Kedụ ebe Nzukọ Katọlik nke ekpo nile nọ?

Na ụbọchị iri atọọ nke Ọnwa nke ịtọọ, n’afọ 1968, Nne anyị dị Asọ bụ Virgin nke Carmel biakutere ụmụaka ụmụ nwanyi inọọ, nime obodo bụ El Palmar de Troya, Utrera, Serville, Spain, n’enu obere osisi an’akpọ lentisk. Ka nkea mesịrị, ndị mmadu bụsasịrị osisi ahụ, site na mgbọlọgwu ruo n’akwụkwọ ya, nke bụ na onwekwaghị ihe fọrọ naya. E gwunyezịrị obere obe (osisi) n’ime oghere esiri na ya bọpụta osisi lentisk ahụ; obe osisi ahụ ka ndi mmadụ n’anorube n’ekpe ekpere. Ebe ahụkwa ka ndị n’ahụ ọhụ n’anata ozi , n’ahụkwa ndị si n’enigwe. Etua ka esi hụba ebea Virgin Maria pụtara izizi ama. Mgbe n’eteghi aka, egwubekwara Onyinyo Iru di Asọ nke Jesu, nakwa nke Nne anyị dị Asọ nke Palmar ebe ahụkwa.

Eweruga ụmụaka ụmụnwayị inọọ ndị izizi, enwekwara ndị ọzọ n’ahụkwa ọhụ pụrụ iche, n’anatakwa ozi dị mkpa sina Enigwe.

Ebea dị Nsọ, nke g’emechaa n’ọdị n’ihu bụrụ Isi ọnọdụ nke Nzukọ Nsọ Palmar, ka Nne Anyị dị Asọ bụ Virgin Maria kwadebere maka ya sitena mpụta ọpụtasịrị n’ebe dị iche iche n’ime ihe karịrị nari afọ garaga, dịka La Salette na 1846, Lourdes na 1856, Fatima na 1917, Garabandal na 1961, nakwa imerime ebe ndị ọzọga.

Ọbụ Ebe dị Nsọ nke Lentisco nke El Palmar de Troya, nke kwupụtabara ọnọdụ n’agbawa obi dị n’ime Nzukọ Katọlik, nakwa ihe nile g’eme ya n’ọdị n’ihu, atam’ ahụhụ na ọgb’ahara g’adakwasị mmadụ nile n’ụwa, mana ihe g’egbochi m’ọbụ menyụnata ajọ ihe ndịa nile bụ ekpere, ọpịpịa, nakwa ikpochapụ kpam kpam ụmụ ajọ ihe ọgbar’ọhụụ ana ekpobata n’ime Nzuko, dịka inye Oriri dị Asọ n’aka, ịkwụ ọtọ kama isekpu ala nata ya, imerime ndị echiri echi (Ukọchukwu na Ndị sista) iwerụga n’usọ m’ọbu kwụsi iyi uwe gosiri na ha bụ ndị echichi.

Imebi Nzukọ sitena igwakọnye okwu asị nime nkụzi ntọn’ala nke Nzukọ, igbanwesị usoro eji efe Chukwu, iwepụ kpam kpam Aja dị Asọ nke Missa, Ikwatu Virgin Maria kasi Asọ nakwa ọtụtụ Ndị dị Asọ n’ọnọdụ ugwu Nzukọ debere ha, bu ihe wetara nnukwu ada nke nmụọ nke imerime ndị otu Nzukọ dara.

Virgin Maria kasị Asọ, dịka Nne Nzukọ Ọ bụ, pụtazịrị ife na obere obodo a bụ El Palmar, n’ụdị onye Nche Atụrụ nke Chukwu na onye Nkụzi ukwu sina Aka Chukwu, Ọ biazịrị idozikwa Nzukọ k’osiri dị na mbụ, ebe ọbụ na Nzukọ Rome abanyego n’ụzọ ịdapụ n’okwukwe. Site mgbea gaba, enweziri imerime mpụta ife Nke nyabụ Virgin Maria kasị Asọ, Dinwenu Anyị Jesu Kristi, Nna dị Ebebe, nakwa ọtụtụ Ndị dị Nsọ ga; ha siri otua, jiri nwayọọ kwadebe maka ihe nile g’eme n’ọdị n’ihu n’ime Nne dị Asọ bụ Nzukọ.

Ka imerime ozi si n’enigwe sitena aka ndị n’ahu ọhụ n’aga n’ihu, nyana ọtụtụ ihe itụnanya ga, na agwọm ọya ga, na ihe ndị ọzọga doro anya na ha si n’enigwe n’emesi, ha dọtara ọtụtụ ndị mmadụ, ọbụghikwa sọsọ ndị si Spain abịa, ọbụazị ndi sin’akụkụ uwa nile, bụ ndị n’achọ ntọnala na eziokwu nke Nzukọ n’akụzi ma n’esokwa, bụ ihe ekpochapụsịrị nime unọ nzukọ rome nile.

Isi onye n’ihu ọhụ nke chukwu họtara maka ikesa ebe nile, ozi nile ndịa pụrụ iche sin’enigwe abịa na El Palmar, bụ nwa okorobịa onye Seville, amụrụ ubọchị 23 nke April, 1946, onye ga emechaa n’ọdị n’ihu bụrụ Pope m’ọbụ Nna nke Nne di Asọ bụ Nzukọ, nke Oche ọchịchị ya g’abụkwa na Ebea dị Asọ. Aha ochichi ya bụrụ Gregory XVII. Clement Dominguez y Gomez dịka isi onye n’ahụ ọhụ, abụghị sọsọ ịdị mkpa n’ịnata ozi, sin’igwe, kamana Virgin Maria dị Asọ jikotara oziya ga na imerime ihe ịtụnanya osi n’aka nwa okorobia nkea n’egosi ga, bụ ihe gosigara eziokwu diga na mkpụta ife nke ya na Ndị sin’enigwe; dịka usoro mara nma O ji apụta, ọtụtụ ntọgha nke ndị mmadụ ga, agwọm ọya tụrụ n’anya, ọnya nke obe nke Dinwenu Anyị akpọrọ “Stigmata”, ma inye oriri Nsọ sina enigwe, na ihe ndị ọzọga. Nyabụ “stigmata” enyere ya bụ otu ihe doro anya gosiri onye ji umeanị acho Eziokwu, na ozi ndịa bụ Eziokwu. Sitena ogea gaba, Clemente Dominguez rụlụ ọlụ kasị sie ike mmadụ ọbụna nwere ike ịlụ. Mana, sitena enyem aka na ike Chukwu, na Nne ya kasị Asọ nyere ya, ọtachịrị, nụọ nnukwu ọgụ iji hụ na Eziokwu meriri. 

Imerime njem k’ojere iji gbasa ozi Enigwe n’enye na El Palmar; ọn’akpọkwa ụwa nile okụ ka ha bịa mata otu Ebea nzọpụta g’esi biara mmadụ nile ebe ọbụ na Nzukọ Rome chọzịrị ịda ruo ala, n’etiti ure, mgbagwoju anya na ọchichịị dakwasara ya. N’agbanyeghị agha an’ebuso ya, tinyere nkatọ na nkwutọ nakwa okwu asị an’ekwugide ya, ọtinyere ikeya na onweya nile n’ime ọlụ a tara akpụ, bụ nke ime ka mmadụ nile nata ozi nile Enigwe n’ezi ya.Oteghị aka, Ikpe ekpere, n’eme ọpịpịa mgbe nile, bụ ihe Dinwenu Anyị na Nne ya kasị Asọ n’ayọ n’Ebe a dị Nsọ, bụkwazị nke ndị nile kwere n’ozia tinyere uchu n’eme, bido mitaba mkpụrụ.

Nwa olemole afọ ka ozi Enigwe a bidosịrị, Dinwenu Anyị tọzịrị ntọala nke nmuọ, sitena ịkwụba Otu Echichi kasị mkpa n’oge Ikpeazua. Imerime ndị otu Echichi a ka echịrị Ụkochukwu me kwa ha Ụkochukwu ukwu bụ Bishop. Ha ka Dinwenu Anyị jikwa mee ndị Isi ochịchị nke Nzukọ an’akpọ “Church Hierarchy” na nganaba ya dị iche iche. Ndi a gbakọtara bụrụ ihe an’akpọ Ọgbakọ ndị Bishop na ndị Apostol, m’ọbụ Episcopal na Apostolic College. Ọgbakọ a bawanyere ụba, bụrụkwa ndị n’echekwaba Ntọnala dị Asọ nke Nzukọ Katọlik ewubere n’Ebea dị Nsọ. Na ebea Chukwu họtara maka ichekwa ịdị asọ na ndịrịgaba nke Nzukọ Katọlik, nke g’emechaa bụrụ ebe aga ewube oche ochịchị nke Pope n’ọdị n’ihu, ọbughị sọsọ na ndị kwere na Nzukọ Palmar kwadebere onweha na nmuọ, ha mepụtakwara ihe dị mkpa an’ahụ anya bụ iwube Ụlọ Ụka nke Chukwu bụ ebe aga n’enye Ya ezi ofufe bụ nke anaghị enyezi Ya ebe ndị ọzọ nile n’ụwa.

Nyabu na otu Ebe a dị Nsọ, ebe Virgin Maria kasị Asọ putara ife, were yọọ ụmụ ya ayịyọ dịka Nne ka ewubezịrị taata nnukwu Ụlọ Ụka bụ Cathedral-Basilica nke Nne Anyị dị Asọ, Ezenwanyị Palmar. Ndị izizi kwere na Nzukọ Palmar, gbara oke mbọ iji mee ka ọlụ Ụlọ Ụka ukwua, dịrịka nrọ, bụrụ ihe mer’eme, makana nnukwu okwukwe na ntụkwasị obi na ekpere ha nwere mere ka Chukwu za ha oku ewere wube nyabụ Ụlọ Uka Ukwu.

Mgbe Pope Paul VI dị Asọ nwụrụ, onye n’ahụ ọhụ bụ Clemente Dominguez, bụ onye echigoro Ụkochukwu Ukwu bụ Bishop, ka Dinwenu Anyị jiri Onwe ya chie Pope, were kpube ya okpu eze ndị Pope, an’akpọ Tiara. Nkea mere mgbe nyabụ Bishop nọ na njem na Santa Fe de Bogota, bụ isi Obodo Columbia ebe Dinwenu Anyị biakwutara ya na ife n’ụzo mara nma dị egwu. Pope ukwu a dị otito kpọrọ oku Ọgbakọ Ukwu abụọ nke ndị isi ọchịchị Nzukọ an’akpọ Holy and Dogmatic Councils, ebe esiri wepụta ife, imerime Nkụzi mara oke nma sina mkpughe Chukwu nyere Ụka, dịka edemede dị iche iche ha wepụtasịrị gbasara nkuzi nke okwukwe, na ezi omume ga.

Ezi Pope n’achị taata bi na El Palmar; aha oji achị bụ Peter III. Sọsọ ya bụ ezi Pope, Onye nọchitere Kristi n’ụwa. Onye ọbụna n’esoghị nyabụ Peter III, esokwaghị Kristi. Nkea pụtara na sọsọ ndị Ụkochukwu nke Otu Nzukọ Nsọ, Katọlik, Apostolic na Palmarian bụ ndị nwere ike n’ezie inye ndị mmadụ Sacrament nile nke Nzukọ ma Chụkwaazị Aja dị Asọ nke Missa.

N’ụbọchị nke taata, imerime ndị biara njem iji fee Chukwu gbakọtara n’ebea dị Nsọ ka ha fee Chukwu n’ụzọ tosiri ya, kwanyekwara Nne ya dị Asọ ugwu tosiri ya, were n’emere Chukwu nmezi maka njọ nke ụwa nile. Usoro ife Chukwu ebea mara nma nke ukwuu, na akwanite mụọ anyị enu na Chukwu, n’enyekwa Okwukwe anyị ndụ mgbe anyị n’eche nmeri nke Nzukọ Nsọ nke Palmar.

Akara eji ama Ezi Nzukọ

1. Nzukọ Kristi bụ otu, ọdị Asọ, ọbụ Katọlik na Apostolic, bụrụkwa Palmarian:

  • Ọ bụ otu na Okwukwe, makana eziokwu ahụ Chukwu gosiri adịghị mgbanwe mgbe ọbụna; Ọbukwazi otu na ọchịchị ya makana enwere sọ otu Onye Isi an’ahụ anya, bụ Pope; ọbụkwazị otu na Sacrament makana ha bụ otu ihe n’ebe ndị otu Nzukọ nile nọ.
  • Ọdị Asọ, makana Onye debere ya dị Asọ; Nkụzi Okwukwe ya dị Asọ; ihe ọchọrọ imepụta nakwa imerime ndị otu ya diga Asọ.
  • Ọbụ Katọlik, makana ozuru ebe nile, jide eziokwu nile, nọrọkwa maka ndị nile nọ n’ụwa.
  • Ọbụ Apostolic, makana Isi ọchịchị ya, na nkụzi ya nile, si n’aka ndị Apostle.
  • Ọbụ Palmarian, makana Isi ọnọdụ ọchịchị ya kịta, nọ na El Palmar de Troya (Serville, Spain)

2. Ezi Nzukọ Kristi, enweghị ihe g’eme ka ọhapụ ụzọ na ọlụ ya jebe ebe ọzọ: Onwekwaghị ihe nwere ike imeri m’ọbụ mebie ya, dịka Onye debere ya, bụ Chukwu siri kwe nkwa “ọn’ụzọ ọkụnmụọ ama emerinata ya”

3. Aha ọzọ ejiri mara Ezi Nzukọ bukwa “Nzukọ Palmar nke ndị otu Kristi, nke Carmelite nke Iru dị Asọ”, m’ọbụ “Nzukọ ndị otu Kristi nke Palmar”, m’ọbụ “Nzukọ Palmar”, ebe ọbụ na Aha ndịa pụtara otu ihe, nyana Otu Nzukọ, Nsọ Katọlik, Apostolic na Palmarian.

4. Nzukọ Palmar bụ sọsọ ya bụ ezigbo Nzukọ nke ndị otu Kristi, bụ aha onwetara sitena aka Kristi, bụ Chukwu, na Onye debere ya.

5. Na ụbọchi nke isii nke ọnwa ḷsatọọ, nke afọ 1978, ka Pope Paul dị Asọ VI nwụsịrị, ka Dinwenu Anyị Jesu Kristi kpọ ndị Apostle Peter dị Asọ na Paul dị Asọ, bịa họta Pope ọhụụ, bụ Saint Gregory XVII kasị Ukwụ. Na amanị ahụ ka Nzukọ Rome kwụsịrị ịbụ ezi Nzukọ.

6. Maka ihi ọdịda nke Nzukọ Rome, Kristi weere Isi Ọnọdụ Nzukọ Ya si Rome wega ya El Palmar de Troya, n’ụbọchị itenanị nke ọnwa August, 1978. Sitena nhọta nke Pope Saint Gregory XVII kasị Ukwu, nyana mwega Isi Ọnọdụ ọchịchị Nzukọ na Palmar de Troya, ka ezi Nzukọ Kristi nwetara Aha akara bu Palmarian.

7. Chukwu Mụọ Nsọ bụ Mkpụl’obi Ezi Nzukọ, nke bụ Otu, Nsọ, Katọlic, Apostolic na Palmarian. Ọbụrụ na mmadụ anọghị n’ime Nzukọ a, inweta obibi n’ime mkpụl’obi nke Chukwu Mụọ Nsọ n’enye Ife, agaghị ekwe omume.

8. Ndi otu Nzukọ Palmar bụ ndị bụkwa ndị otu Carmelite nke Iru dị Asọ, ndị ha na Kristi na Maria nọ n’otu, nke nwere Nganaba itọọ: Ndị nwoke echiri echi, Ụmụ nwanyị echiri echi, na Ndị Agba nke Itọọ, bụ ndị Kwerenu.

9. Ka ọnwa July dị na ụbọchị iri itọọ, n’afọ 1982, Pope Saint Gregory XVII napụrụ ike nile n’aka ndị Bishop, Ụkọchukwu na deacon nile n’esoghi n’Otu Nzukọ, Nsọ, Katọlik, Apostolic na Palmarian. O wepụkwara akara ịdị nsọ n’ebe relic, onyinyo nile, ma nke akpụrụ akpụ, ma nke esere ese, na altar ga, na ihe ndị ọzọ ga nọ n’ime Nzukọ ndị dara ada, ndị ụka asị, na ndị kewapụrụ onwe ha n’ezi Nzukọ. Ihe ọzọkwa bụ na ọnụnọ n’ezie nke Kristi na Maria, na Eucharistia kwusịrị ịdị na tabernacle nile n’ụwa, ndị n’abụghị nke Nzukọ Palmar.

10. Ndị Bishop, Ụkọchukwu na deacon nile n’esoghi n’ime Otu Nzukọ, Nsọ, Catholic, Apostolic na Palmarian, enwezighị ike ịlụ ọlụ ọbụna bụ nke dịịrị Ụkọchukwu.